1Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
2Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
3O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
4O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.