2 Pita 2

Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.

2 Peter 2:12 (UKJV) But these, as natural brute beasts, made to be taken and destroyed, speak evil of the things that they understand not; and shall utterly perish in their own corruption;

10Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

11Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị.

12Lee ka ha si na-ekwulu ihe ndị ha aghọtaghị. Ha dị ka ụmụ anụ ọhịa, ndị nzuzu na-eme naanị ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha. Ndị a mụrụ naanị maka ijide ha ma bibiekwa ha. A ga-egbu ha otu e si egbu ụmụ anụ ọhịa ndị a.

13A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri.

14Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.