2 Pita 2

Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.

2 Peter 2:15 (UKJV) Which have forsaken the right way, and are gone astray, following the way of Balaam the son of Bosor, who loved the wages of unrighteousness;

13A ga-eji ntaramahụhụ kwụghachi ha ụgwọ ihe ọjọọ ha mere. Ihe na-atọ ha ụtọ bụ ịkpọ oriri na ọṅụṅụ nʼetiti ehihie. Ha bụ ihe ihere, bụrụkwa ndị na-ewetara unu ntụpọ ma ọ bụrụ na ha na-eso unu na-erikọta oriri.

14Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.

15Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.

16Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ.

17Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.