2 Pita 2

Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.

2 Peter 2:17 (UKJV) These are wells without water, clouds that are carried with a tempest; to whom the mist of darkness is reserved for ever.

15Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.

16Ma a baara ya mba maka ajọ omume ya, mgbe e mere ka ịnyịnya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu; gbochie ọrụ onyeisi na-adịghị mma nke onye amụma ahụ chọrọ ịrụ.

17Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.

18Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.

19Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.