2 Pita 2

Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ.

2 Peter 2:21 (UKJV) For it had been better for them not to have known the way of righteousness, than, after they have known it, to turn from the holy commandment delivered unto them.

19Ha na-ekwe ha nkwa inwere onwe ha, ma ha onwe ha bụ ohu nye ihe rere ure, nʼihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọbụla na-achị achị nʼime ya.

20Mgbe ha sitere nʼihe niile emerụrụ emerụ nke ụwa gbapụ, site na mmazu nke Onyenwe anyị, na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, bụrụ ndị atụhịrị na mmehie ọzọ, bụrụkwa ndị e meriri, ha ga-abụ ndị ọnọdụ ha ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.

21Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ.

22Ilu ndị a bụ eziokwu banyere ha sị, “Nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,” ya na, “Nne ezi a sachara ahụ laghachiri ọzọ ịtụrụ onwe ya nʼapịtị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.