2 Pita 3

Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.

2 Peter 3:13 (UKJV) Nevertheless we, according to his promise, look for new heavens and a new earth, wherein dwells righteousness.

11Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,

12dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.

13Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.

14Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.

15Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.