2 Pita 3

na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”

2 Peter 3:4 (UKJV) And saying, Where is the promise of his coming? for since the fathers fell asleep, all things continue as they were from the beginning of the creation.

2Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.

3Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ

4na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”

5Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.

6Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.