4na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”
5Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.
6Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.
7Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
8Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.