13Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
14Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
15Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
16Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”
17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.