5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
9“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’