4Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’