2 Samuel 11

Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem.

2 Samuel 11:1 (UKJV) And it came to pass, after the year was expired, at the time when kings go forth to battle, that David sent Joab, and his servants with him, and all Israel; and they destroyed the children of Ammon, and besieged Rabbah. But David tarried still at Jerusalem.

1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem.

2Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.

3Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.