10Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?”
11Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.”
12Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya.
13Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.
14Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya.