2 Samuel 11

Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.

2 Samuel 11:26 (UKJV) And when the wife of Uriah heard that Uriah her husband was dead, she mourned for her husband.

24Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.”

25Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.”

26Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.

27Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.