2 Samuel 11

Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.”

2 Samuel 11:5 (UKJV) And the woman conceived, and sent and told David, and said, I am with child.

3Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het.

4Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya.

5Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.”

6Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.”

7Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.