7Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga.
8Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ.
9Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze.
10Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?”
11Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.”