17Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”
18Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
19Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.
20Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.
21Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu.