15Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”
16Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.
17Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”
18Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
19Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.