13Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”
14Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.
15Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”
16Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.
17Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”