2 Samuel 13

Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

2 Samuel 13:14 (UKJV) Nevertheless he would not hearken unto her voice: but, being stronger than she, forced her, and lay with her.

12Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a.

13Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”

14Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

15Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”

16Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.