24Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”
25Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.
26Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”
27Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa.
28Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”