2 Samuel 13

Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”

2 Samuel 13:24 (UKJV) And Absalom came to the king, and said, Behold now, your servant has sheepshearers; let the king, I plead to you, and his servants go with your servant.

22Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.

23Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.

24Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”

25Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.

26Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.