2 Samuel 13

Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

2 Samuel 13:3 (UKJV) But Amnon had a friend, whose name was Jonadab, the son of Shimeah David's brother: and Jonadab was a very subtle man.

1Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.

2Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

3Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

4Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”

5Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.