3Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.
4Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”
5Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ”
6Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”
7Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.