35Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.”
36Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.
37Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn.
38Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ.
39Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.