7Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.
8Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.
9Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya. Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara.
10Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.
11Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.”