2 Samuel 14

“Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ.

2 Samuel 14:15 (UKJV) Now therefore that I am come to speak of this thing unto my lord the king, it is because the people have made me afraid: and your handmaid said, I will now speak unto the king; it may be that the king will perform the request of his handmaid.

13Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ nʼihi gịnị ka ị chere ihe dị otu a megide ndị nke Chineke? Mgbe eze na-ekwu otu a, ọ bụ na ọ dịghị ama onwe ya ikpe, nʼihi na eze a jụla ịkpọghachi nwa ya a chụpụrụ achụpụ?

14Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.

15“Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ.

16Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’

17“Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.