2 Samuel 14

Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’

2 Samuel 14:16 (UKJV) For the king will hear, to deliver his handmaid out of the hand of the man that would destroy me and my son together out of the inheritance of God.

14Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.

15“Ma ugbu a, ebe m bịara ịgwa onyenwe m bụ eze, okwu a, nʼihi na ndị mmadụ emenyela m egwu. Ohu gị chere nʼobi ya, ‘Aga m agwa eze okwu; ma eleghị anya, ọ ga-emezuru ohu ya nwanyị ihe ọ rịọrọ.

16Ma eleghị anya eze ga-anapụta ohu ya nwanyị site nʼaka nwoke ahụ na-agbalị ibipụ mụ na nwa m nwoke site nʼihe nketa nke Chineke.’

17“Ugbu a, ohu gị nwanyị na-asị, ‘Ka okwu onyenwe m eze kwuru wetara m izuike, nʼihi onyenwe m eze na-enyochapụta ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ dịka mmụọ ozi Chineke. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị.’ ”

18Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.” Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.