19Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a.
20Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”
21Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
22Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
23Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem.