26Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
27Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
28Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya,
29o ziri ozi ka Joab bịa, ka ọ gaa ziere ya eze ozi, ma Joab abịaghị. Absalọm zigakwara ozi ọzọ ka ọ bịa ma Joab ekweghị ịbịa.
30Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.