24Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
25Ọ dịghị nwoke mara mma dịka Absalọm nʼala Izrel niile. Ọ dịkwaghị onye na-adịghị ekwu okwu banyere ịma mma ya. Nʼihi na ntụpọ ọbụla adịghị ya nʼahụ site nʼopi isi ya ruo nʼọbọ ụkwụ ya.
26Mgbe ọbụla ọ kpụchara ntutu isi ya, nʼihi na ọ bụ otu ugboro nʼafọ ka ọ na-akpụcha agịrị isi mgbe o bidoro ịnyị ya arọ. Ọ na-atụ agịrị isi a na-akpụchapụta ya nʼisi, ịdị arọ ya na-eru narị shekel abụọ ma a tụọ ya nʼihe ọtụtụ eze.
27Absalọm mụtara ụmụ ndị ikom atọ, na otu nwanyị, aha ya bụ Tama. Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu.
28Mgbe Absalọm nọrọ afọ abụọ na Jerusalem na-ahụghị eze anya,