30Nʼikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Gaanụ sunye ubi ọka balị Joab dị nʼakụkụ nke m ọkụ.” Ha mekwara dịka a gwara ha.
31Mgbe ahụ, Joab biliri jee nʼụlọ Absalọm, ma sị ya, “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji gbaa ubi m ọkụ?”
32Absalọm sịrị ya, “Lee ezitere m gị ozi, sị, ‘Bịa nʼebe a ka m ziga gị na nke eze ka ị jụta, “Nʼihi gịnị ka m ji site na Geshua lọghachita? Ọ gara a kara m mma ma a sị na m nọ nʼebe ahụ ruo ugbu a.” ’ Ugbu a, achọrọ m ka mụ hụ ihu eze, ọ bụrụ na onwe ajọ omume dị nʼime m, ya mee ka m nwụọ.”
33Joab gakwuru eze, gwa ya ihe Absalọm kwuru. Mgbe ahụ, eze kpọrọ Absalọm, onye batara ma kpọọ isiala nʼihu eze. Eze sutukwara ya ọnụ.