2 Samuel 15

Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.”

2 Samuel 15:28 (UKJV) See, I will tarry in the plain of the wilderness, until there come word from you to certify me.

26Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”

27Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo.

28Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.”

29Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ.

30Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.