2 Samuel 15

Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi.

2 Samuel 15:6 (UKJV) And on this manner did Absalom to all Israel that came to the king for judgment: so Absalom stole the hearts of the men of Israel.

4Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.”

5Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ.

6Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi.

7Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya.

8Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.