2 Samuel 15

Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.

2 Samuel 15:9 (UKJV) And the king said unto him, Go in peace. So he arose, and went to Hebron.

7Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya.

8Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ”

9Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.

10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”

11Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.