2 Samuel 15

Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.

2 Samuel 15:11 (UKJV) And with Absalom went two hundred men out of Jerusalem, that were called; and they went in their simplicity, and they knew not any thing.

9Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.

10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”

11Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.

12Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.

13Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.