2 Samuel 15

Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.

2 Samuel 15:12 (UKJV) And Absalom sent for Ahithophel the Gilonite, David's counsellor, from his city, even from Giloh, while he offered sacrifices. And the conspiracy was strong; for the people increased continually with Absalom.

10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ”

11Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.

12Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.

13Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm.

14Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.