1Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
2Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
3Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?” Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ”