2 Samuel 16

Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”

2 Samuel 16:12 (UKJV) It may be that the LORD will look on mine affliction, and that the LORD will requite me good for his cursing this day.

10Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ”

11Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m.

12Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”

13Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ.

14Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.