2 Samuel 16

Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.

2 Samuel 16:5 (UKJV) And when king David came to Bahurim, behold, thence came out a man of the family of the house of Saul, whose name was Shimei, the son of Gera: he came forth, and cursed still as he came.

3Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?” Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’ ”

4Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.” Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.”

5Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.

6Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe.

7Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.