2 Samuel 16

Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!

2 Samuel 16:7 (UKJV) And thus said Shimei when he cursed, Come out, come out, you bloody man, and you man of Belial:

5Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.

6Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe.

7Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!

8Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”

9Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.