6Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe.
7Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!
8Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”
9Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”
10Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’ ”