13Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.”
14Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.
15Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ.
16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”
17Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid.