2 Samuel 17

Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.

2 Samuel 17:14 (UKJV) And Absalom and all the men of Israel said, The counsel of Hushai the Archite is better than the counsel of Ahithophel. For the LORD had appointed to defeat the good counsel of Ahithophel, to the intent that the LORD might bring evil upon Absalom.

12Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha.

13Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.”

14Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.

15Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ.

16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.