2 Samuel 17

Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ

2 Samuel 17:18 (UKJV) Nevertheless a lad saw them, and told Absalom: but they went both of them away quickly, and came to a man's house in Bahurim, which had a well in his court; where they went down.

16Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ”

17Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid.

18Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ

19Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.

20Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.