2 Samuel 17

Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.

2 Samuel 17:22 (UKJV) Then David arose, and all the people that were with him, and they passed over Jordan: by the morning light there lacked not one of them that was not gone over Jordan.

20Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.

21Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.”

22Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.

23Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.

24Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.