2 Samuel 17

Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.

2 Samuel 17:24 (UKJV) Then David came to Mahanaim. And Absalom passed over Jordan, he and all the men of Israel with him.

22Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.

23Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.

24Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.

25Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab.

26Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.