2 Samuel 18

Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.”

2 Samuel 18:3 (UKJV) But the people answered, You shall not go forth: for if we flee away, they will not care for us; neither if half of us die, will they care for us: but now you are worth ten thousand of us: therefore now it is better that you help us out of the city.

1Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha.

2Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.”

3Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.”

4Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku.

5Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.