5Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.
6Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem.
7Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ.
8Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu.
9Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.