2 Samuel 19

Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.”

2 Samuel 19:14 (UKJV) And he bowed the heart of all the men of Judah, even as the heart of one man; so that they sent this word unto the king, Return you, and all your servants.

12Ụmụnne m ka unu bụ, ọkpụkpụ m na anụ ahụ m. Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-akpọlata eze nʼụlọ ya?’

13Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ”

14Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.”

15Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan.

16Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.